Anyaukwu na Ntaramaahụhụ So Ya Dịka Ọ Dị N’Omenaala Igbo: Nrụtụaka N’Ejije Igbo
Abstract
Ndị Igbo bụ agbụrụ nwere omenaala e ji mara ha nke ha kwenyesịrị ike na ya.Ọ bụkwa ụzọ ha si eme ihe ọ bụla ha nwere na ndụ. Nke a metụtakwara ma asụsụ, agụmagụ ha nakwa ihe ndị ọzọ. Nkwenye n’omenaala ndị Igbo bụ n’ibi ezi ndụ kacha mma n’ihe ọ bụla mmadụ na-eme. Ha kwenyekwara na onye ọ bụla biri ajọ ndụ ma ọ bụ na-eme omume ndị mmadụ na-agbarụrụ ihu gaanatarịrị ntaramaahụhụ dịịrị ya. Otu n’ime ihe ndị ahụ ọhanaeze na-agbarụrụ ihu bụ anyaukwu. N’ihi nke a, nchọcha a gbadoro ụkwụ n’isiokwu bụ anyaukwu ma werekwa ngalaba agụmagụ bụ ejije nke gụnyere Ihe Onye Metere nke Okedịadị Nkechinyere dere, na Onye Ụlọ Egbughi Onye nke Obidiebube Joyce dere dịka ihe nlere anya. Nke a bụ iji mee ka a mata na agụmagụ bụ enyo nhụrụụwa. Usoro a gbasoro bụ nke nkọwasị. Nsogbu nchọcha a bụ na ọtụtụ ndị mmadụ anaghị eche maka ọghọm ma ọ bụ ntaramaahụhụ ga-abịa n’ikpeazụ n’ihi agwa ọjọọ ha. Ndị nchọcha gbara mbọ ịchọpụta ihe ndị na-ebute anyaukwu nakwa agwa ndị mejupụtara ya. E gosipụtakwara ụzọ ndị odee ejije ndị a, a họọrọ si zipụta anyaukwu, ntaramaahụhụ e nyere onye anyaukwu. Ndị nchọcha nyekwara ntụziaka iji gbaziere ọhanaeze olu n’ụzọ obibi ndụ ha. Nchọpụta anyị gosiri na ihe ndị na-ebute anayukwu gụnyere; oke ọchịchọ, mkpọrọmaasị, ụfụanya, ajọ ọyị, okwu asị nakwa aka azụ. N’ikpeazụ, nchọcha a ga-enyekwa aka n’ịkwalite asụsụ Igbo ma sitekwa n’ụzọ dị otu a, bawanye agụmagụ na omenaala Igbo.