Uru Asụsụ Ọdịnaala (Igbo) bara n’Ịkụziri ndị Okenye nọ n’Ime Eobodo maka Ọrụ Ugbo na Steeti Ebonyi, Nigeria.
Abstract
Nchọcha a lebara anya n’uru asụsụ ọdịinala bara n’ịkụziri ndị okenye nọ n’ime obodo maka ọrụ ugbo na Steeti Ebonyi. Onye nchọcha gbasoro usoro sọvee kenkowa wee mee nchọcha a. Ajụjụ nchọcha abụọ ka e ji wee mee nchọcha a. Onye nchọcha ji usoro nsere ebumnuche wee họpụta ndị okenye dị otu narị na iri atọ (130) bụ ndị e ji mee nchọcha a, Ngwa nchocha bu njumaza nke ihe e depụtara n’ime ya di iri na asaa (17), bukwa nke onye nchọcha jiri aka ya depụta. E jiri pacenti (%) na miin (????̅) wee zaa ajụjụ nchọcha. A chọpụtara na iji asụsụ ọdinala akụziri ndị okenye nọ n’ime obodo maka ọrụ ugbo na-eweta ọtụtụ uru ndị gụnyere: Ọ na-ewulite nkuzi na mmụta mee ka ọ dị ire; Ọ na-eme ka nkuzi na omụmụ ihe dị mfe na nghọta, Ọ na-eme ka ha na-enwe ọnụ oge ha na-amụ ihe n’ihi na ọ bụ asụsụ ha na-aghọta ka e ji akụziri ha. Ọzọ kwa, ọ na-eme ka a mata obodo onye si na ya, na-echekwara ha omenaala na nkwenye ha. Ọ na-eme ka udo na ịdịnotu na-achị n’etiti ndị ọrụ ugbo na ndị na-akụziri ha ihe. Ọ na-ebelata ọnọdụ itịbọrịbọ n’etiti ndị okenye ahụ bị n’ime obodo arụ ọrụ ugbo, dgz. Site n’ihe ndị a a chọpụtara onye nchọcha tụtara alọ ndị a; ka ndị na-akụziri ndị okenye maka ọrụ ugbo ga-abụ naanị ndị maara asụ ma na-ede asụsụ ọdịnaala ndị ha na-akụziri. Ọzọ kwa, ọ bụ naanị asụsụ ọdịnaala (Igbo) ka a ga-eji enye ọkwa di mkpa na mgbasa ozi ndị ọzọ maka ọrụ ugbo n’igwe okwu na nke onyonyo (redio na televishion). A ga-edepụta akwụkwọ jọnalụ maka ọrụ ugbo n’asụsụ ọdịnaala ma n’olundi ndị okenye ahụ a na-akuziri ihe, nke a ga-eme ka ha na-aghọta ihe a na-akọ banyere usoro ọgbara ọhụrụ n’ikọpụta na ichekwa ihe oriri. Nke a ga-enye aka belata ụkọ ihe oriri na ụbịam na Steeti Ebonyi ma na gburugburu Naịjirịa niile.