Ndị Igbo na Nkwalite Asụsụ Igbo

  • Ndubuisi Ahamefula
  • Chinwe Nwaudu. Udechukwu

Abstract

Nsogbu asụsụ Igbo na-enwe si n’aka ndi Igbo n’onwe ha. Anyị ga-asa ajụjụ ọ bụla gbasara ihe mere asụsụ Igbo. Akwụkwọ a na-atụle ihe na-ebute ọdịda ma ọ bụ ọnwụ asụsụ Igbo. Ọ na-atụlekwa ihe ndị anyị kwesiri ime ka asụsụ Igbo nweta ọnọdụ kwesiri ya na Naịjirịa nakwa na mba ụwa niile n’ihi na ndị Igbo anaghi eti mmanwụ a na-akwa aka. Nkụ dị na mba na-eghere mba nri. Anyị kwesịrị ime asụsụ Igbo anyị a ka ọ bụrụ a kwaa a kwụrụ. Nke a ga-ebido n’ ezinaụlọ na ogbe ndị Igbo niile, gawa n’ụlọụka, ọmaahịa, ụlọakwụkwọ, ụlọikpe, ụlọ mbipụta akwụkwọ, ụlọ ndị omeiwu, ụlọọrụ ga nke gụnyere ụlọ mgbasa ozi dị iche iche na ụlọọrụ gọọmentị dị iche iche: O doro anya na anyị kwesịrị ịgba mbọ mee ka asụsụ Igbo kwụrụ chịm. Akwụkwọ a ga-atụlekwa ọnọdụ Igbo n’ebe ọ gbasara igwe kọmputa, ekwentị mkpanaaka na ọwaikuku nntanetị. Nkebi ndị dị n’akwụkwọ a gụnyere ndubata, asụsụ Igbo n'ụlọ akwụkwọ dị iche iche, asụsụ Igbo n'ezinaụlọ ndị Igbo, asụsụ Igbo n'aha ndị Igbo, asụsụ Igbo n'edemede, asụsụ Igbo n'usoro odide Igbo, asụsụ Igbo na mgbasa akụkọ, asụsụ Igbo n'ekwentị mkpanaaka na nchịkọta.

Published
2024-10-02
Section
Articles