Mkpọbi ụkwụ dị n’Imejupụta Atụmatụ Kurikulum Asụsụ Igbo n’Ogo Agụmakwụkwọ nke Bezik Na Steeti Ebonyi, Nigeria

  • N. Nwigwe na Eze, J. N.
Keywords: Mkpọbiụkwụ, atụmatụ agụmakwụkwọ, kurikulum, asụsụ Igbo, Bezik 1 –

Abstract

Nchọcha a lebara anya n’ịchọpụta ihe mkpọbi ụkwụ a na-ahụta n’imejụpụta atụmatụ kurikulum asụsụ Igbo n’ogo agụmakwụkwọ nke Bezik na Steeti Ebonyi. Onye nchọcha gbasoro usoro sovee ke nkọwa wee mee nchọcha a, ebe ọnụọgụ ndị e jiri mee nchọcha dị otu narị na iri atọ (130) ndị isi ụlọakwụkwọ na ndi nkuzi n’ogo Bezik 1–3, bụkwa ndị onye nchọcha jiri usoro nsere ke ebumnuche wee họpụta. Ngwa nchọcha bụ njụmaza nke ihe e depụtara n’ime ya dị iri na asatọ (18), bụkwa nke onye nchọcha jiri aka ya dee. Data a kpakọtara ka e jiri miin (????̅) na pacenti (%) wee hazie. A chọpụtara na enweghị akwụkwọ ọgụgụ Igbo, enweghị ndị nkuzi tozuru etozu, ọtụtụ ọnụọgụ ụmụ akwụkwọ nọ n’otu klaàsị na ejighị asụsụ epum nwata akụziri ya ihe tinyere ihe ndị ọzọ bụcha ihe mkpọbi ụkwụ a na-enweta n’imejupụta atụmatụ kurikulum asụsụ Igbo n’ogo agụmakwụkwọ nke Bezik na Steeti Ebonyi. Site n’ihe ndị a a chọpụtara onye nchọcha tụtara alo; ka ndị nkuzi na-erube isi n’ihe polici ke agụmakwụkwọ kwuru maka iji asụsụ epum akuziri ụmụaka nọ n’ogo Bezik 1 – 3 ihe; ime ka akwụkwọ ọgụgụ Igbo ghara ịbụ ihe dịụkọ na izụpụtandị nkụzi tozuru etozu na ihe ndị ọzọ. Ihe ndia ga-enye aka n’imejụpụta atụmatụ kurikulum asụsụ Igbo n’ogo agụụmakwụkwọ nke Bezik na Steeti Ebonyi.

Published
2024-10-02
Section
Articles