Mpụtara Ụbara Echiche N’ụtọasụsụ Igbo

  • Ọlachi Florence Okere

Abstract

Okwu ọ bụla mmadụ kwuru na-enwe mpụtara site n’ihe onye kwuru ya bù n’obi na ka o siri hụta ya. Edemede a nke isiokwu ya bụ “Mpụtara ụbara echiche n’ụtọasụsụ Igbo” lebara anya na mpụtara okwu ụfọdụ ndị e nwere n’asụsụ Igbo kpọm kwem. E lebakwara anya n’ụzọ dị iche iche otu okwu si enwe mpụtara dị iche iche. Nchọcha a bù n’uche izipụta ụdị mpụtara dị iche iche e nwere n’ụtọasụsụ Igbo tinyere ịkọwapụta echiche dị iche iche ụfọdụ okwu Igbo nwegasịrị. Nchọcha a bụ nke ọba akwụkwọ ebe nwa nchọcha si nwete ụfọdụ akwụkwọ ọgụgụ na edemede nchọcha ndị odee ụfọdụ derela ihe yitere isiokwu nke a na ha. Ndị nchọcha a ga-abara uru karịsịa bụ Ụmụ akwụkwọ, ndị nkụzi ndị nchọcha, wdg. N’ikpeazụ, a tụrụ aro ka ndị nchọcha n’ọdịniihu lebazie anya n’isiokwu a ma chọpụta ebe o nwere oghere mejuo ya. Ka e mesịrị nchọcha a, a chọpụtara na mpụtara bụ ejewe aghaghị n’ihe gbasara asụsụ ọ bụla, ọ kachasị n’asụsụ Igbo ebe bụ mgbakwasị ụkwụ edemede a.

Published
2024-10-02
Section
Articles