ỌNỌDỤ EKERECHI N’AGỤMAGỤ EDEREDE IGBO

  • Nkoli Mercy Nnyigide

Abstract

Ederede a na-eleba anya na nzipụta ekerechi n’agụmagụ Igbo. E lee anya na gburugburu mmadụ taa, okwu a kpụ n’ọnụ bụ mmekpaahụ dị iche iche ekerechi naenye mmadụ dịka: iju, mbize nke na-ebute ụnwụ, ọnwụ mmadụ na nsogbu dị iche iche nye mmadụ. N’agbanyeghị na ndị odee na-ezipụta ekerechi n’agụmagụ Igbo, ọkachasị n’abụ ederede Igbo, nwanchọcha chọpụtara na ndị onyocha agụmagụ Igbo kara nwe mmasị n’inyocha ihe ndị metụtara omenala, ndọrọndọrọ ọchịchị, ekpemekpe, jenda, dgz. Nke a na-egosi na ha enwekebeghị mmasị n’inyocha ekerechi a na-ezipụta n’agụmagụ Igbo. Ọ bụ ọnọdụ a kpalitere ederede a nke na-enyocha ekerechi dị iche e zipụtara n’ọyọkọabụ mbụ e bipụtara n’Igbo a na-akpọ Akpa Uche. Ebumnobi ederede a bụ ịchọpụta ọnọdụ ekerechi n’agụmagụ Igbo nakwa ịnyocha ekerehi dị iche iche e zipụtara n’ọyọkọabụ. A gbasoro usoro atụtụ ekokritisizim n’inyocha ụfọdụ ekerechi e zipụtara n’ọyọkọabụ a. Site na nnyocha e mere, a chọpụtara na ndị odeabụ Igbo naesite n’abụ zipụta nkamma ekerechi na uru dị iche iche ekerechi baara mmadụ. A naatụ anya na ederede a ga-enye aka kpọlite mmụọ ọtụtụ mmadụ ọkachasị ndị ọgụụ na ndị ọkammụta Igbo n’ebe ekerechi dị.

Published
2022-06-20
Section
Articles