MMEBE NA NTỤGHARI MKPỤRỤOKWU BEKEE N’IGBO: NSOGBU NA ỤSA NYE YA
Abstract
Mgbe ọ bụla a na-ekwu maka ntụgharị, ihe ọzọ a na-ajụ ase ya bụ mkpụrụokwu a ga-atụgharị. Mkpụrụokwu dị ome ntụgharị nnukwu mkpa. O nwere ike ịbụ mkpụrụokwu agụmagụ, nka na ụzụ ma ọ bụ nke mkpokọta ka ọ chọrọ iji hụ na ntụgharị ya bụ kpoo. A na-emepụta mkpụrụokwu ọhụrụ dị iche iche na mba ụwa dị iche iche iji nwee aha a ga na-akpọ ọtụtụ ihe ọhụrụ na-apụta kwa ụbọchị n’ụwa taa. Mana ọ bụ ihe mwute na asụsụ Igbo etorubeghị ka asụsụ ndị a a na-ekwu maka ha n’ụwa taa dị ka Bekee, French, Jaman, Chaịna, wdg. Ndị ọka ntụgharị n’onwe ha na-agabiga ihe nhịam ahụ dị egwu mgbe ha na-emepụta okwu ohụrụ. Ederede a lebara anya na nsogbu dị iche iche a na-agabiga n’imebe mkpụrụokwu ọhụrụ n’Igbo, mbọ ndị ọka mmụta gbarala na ihe ndị a ga-eme iji belata nsogbu ndị a. A gbasoro atụtụ nṅomite, ndaịta na nke mmebe mkpụrụokwu nke (Ajụnwa 2014). A gbasoro nsoro nkanye akara ụdaolu ke Green na Igwe (1963), bụ nke maziri na a ga-akanye akara n’ụda ala na ụda nsụda naanị ka ụda elu wee ghara ibu akara ọ bụla. Dị ka e nwere usoro ndekọ na ndesa n’odide asụsụ Igbo, a gbasoro usoro ndesa n’ide mkpụrụokwu ndị dị n’ederede a. Naanị mkpụrụokwu ndị e dekọrọ ọnụ bụ ndị e dekọrọ ọnụ n’akwụkwọ Ọkaasụsụ Igbo bụ nke ndị otu a kpọrọ SPILC dere. Ederede a ga-aba uru n’ụlọ akwụkwọ niile a na-amụ asụsụ Igbo nye ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ. Ndị ụlọ mgbasa ozi na otu ISA ga-eritekwa nnukwu uru na mkpụrụokwu ọhụrụ ndị e mebere. O kwesịrị ka e tutekwa otu SPILC na ISC (The Igbo Standardization Committee). Gọọmentị kwesịrị itinye aka n’ihe gbasara ịzụpụta ndị ntụgharị na ndị mmebe okwu. E kwesịrị iwube ọba akwụkwọ ebe a ga na-achọta okwu ọhụrụ ndị e mebere.