MKPỤRỤOKWU MBITE NA MGBANWE MPỤTARA N'ASỤSỤ IGBO
Keywords:
Mkpuruokwu, Okwu mbite, Mgbanwe mpụtara, Asụsụ Igbo
Abstract
Asụsụ ọ bụla dị n’ụwa a nwere mkpụrụokwu dị iche iche o siri n'asụsụ ọzọ bite iji mee ka o nwee ike kọwapụtacha echichi ọhụrụ dị iche iche nke sitere na nkanụzụ, mmepe, okpukperechi, na azụmahịa. Ọtụtụ oge a na-enwe mgbanwe mpụtara nke mkpụrụokwu ndị ahụ e bitere ebite. Ọ bụ ọnọdụ a kpalitere nchọcha a. Nchọcha a bụ nchọcha enweọgụ nke e jiri ịgba ajụjụ ọnụ a haziri ahazi na ihe ndị a gụtara n'akwụkwọ dị iche iche nweta njiatule ya. Mbunuche nchọcha a bụ ịchọpụta ma e nwere mgbanwe mpụtara n'ụfọdụ mkpụrụokwu mbite dị n'asụsụ Igbo. A chọpụtara na mgbanwe mpụtara na mkpụrụokwu mbite na-apụtakarị ihe n'ụdị mgbatị ma ọ bụ mmakọ echiche.