NYOCHA OMENALA NA AKANKA AKWỤKWỌ ỌJA DUFUO DIKE NKE RAY C. ANENE
Abstract
Ọrụ nchọcha a gbadoro ụkwụ na ntụcha akwụkwọ Ray C. Anene nke ọ kpọrọ, Ọja Dufuo Dike iji tuchapụta akankà odee ya, mee ya ka o see elu. Ihe ọmụmụ a bụ nchọcha enweghị mgbakọ. Ihe ọmụmụ a n'ụdị ya gbadokwara ụkwụ na nchọcha nkọwa n'ihi na mbunuche ya bụ iseka ma kọwaa ka odee siri jie nka dị iche n'ọrụ ya. Ọtụtụ nsogbu ndị na-esite n'ahụghị akwụkwọ e ji ebido aka n'oge a na-eme nchọcha n'Igbo, tụmadi nchọcha gbasara nnyocha nka na akanka agụmagụ bụ ihe nchọcha a gboro. Ihe ọmụmụ a gbadoro ụkwụ n'isiokwu atọ: ịchọpụta omenala na nka agụmagụ odee gasị, ịchọpụta agwa na ka o si zipụta ha, na ileba anya n'asụsụ, tụmadi n'omenala Igbo ndị pụtara ìhè na ya. N'ikpeazụ, ndị ome nchọcha chọpụtara na e nwere ụfọdụ ndehie, obere nghasa echiche dị n'akwụkwọ ya. Nke a ga-agbazịri ndị ọzọ chọrọ iwere agụmagụ hiri isi ka ha ghara iso ụzọ ahụ wee mee ụdị mmehie ahụ. Ndị ome nchọcha hụtakwara na ụfọdụ olu ndị na okwu Bekee ndị e ji usoro nsupe Igbo dee n'akwụkwọ ahụ ga-enye aka n'ịkwalite na n'iwulite asụsụ Igbo. Ndị mere nchọcha gakwara n'ihu wee nye ntụziaka n'ụzọ ndị a ga-esi mee nchọcha ndị yitere nke a maka ọdịmma mwụlite na nkwalite asụsụ Igbo. Ntule ụdị akanka a n'ọrụ ndị odee ndị ọzọ, nkwuputa na nzipụta akanka ndị odee agụmagụ ji dee agụmagụ ha gaeme ka ụmụ akwụkwọ na-enwe mmasị n'ịgụ akwụkwọ agụmagụ Igbo oge ọ bụla na n'ebe ọ bụla.