NSEKA MMETỤTA ASỤSỤ BEKEE NA-ENWE N'ASỤSỤ IGBO

  • Ngozi Theresa Onuora (PhD)
  • Ann Chinazo Onyekelu (PhD)
  • Obasi Benedeth Chibuzor
  • Daniel Aliomo Alegu
Keywords: Asụsụ, omume asụsụ, ngafere asụsụ, ngwakọ asụsụ, mgbochibido asụsụ

Abstract

Ngwọtọkọ asụsụ Igbo na Bekee bụ ihe na-arị ibe ya elu n'ala Igbo nakwa ebe niile a na-asụ asụsụ Igbo n'ụbọchị taata. Ụfọdụ ka amaghị Igbo asụ bụụrụ ibu arọ, ebe ụfọdụ ji ya eme ngala. Ụfọdụ ụmụaka ndị a mụrụ ọhụrụ amaghịzị ka e si asụ asụsụ Igbo a, ihe nke a wee bụrụ ihe jọgburu udele wee sigbuo nkakwụ. Ndi ụwa dum wee na-ajụ ma ọ bụkwa mmadụ nwe ọgọdọ ewu na-ata? Ọ bụ ụdị ọnọdụ ọjọọ a kpaliri mmụọ ndị omee nchọcha a, ha wee malite njem iseka ụdị ngwọtọ ndị ahụ na ihe na-ebuta ya. A tụchasịrị ụdị nhụsianya a asụsụ Igbo na-ahụsi n'ebe asụsụ Bekee dị wee chọpụta na ihe na-esi nkakwụ isi si ya n'ọkpụkpụ, nke pụtara na asụsụ Bekee nwere ọtụtụ mmekpa ahụ n'ebe asụsụ Igbo dị. Nke a wee na-akọwa na ọ bụrụ na ọ ga-enwe ihe ọ bụla a ga-eme banyere ihe a, ndị nne na nna na ndị nkụzi asụsụ Igbo ga ebido sụwara ụmụaka na ụmụ akwụkwọ asụsụ Igbo n'ihi na a naghị amụ aka ekpe na nka

Published
2025-05-07
Section
Articles