Mmetụta Adịmire Ngwa Nkuzi Nụrụlere N’ebe Mmeta Nkeọma Ụmụakwụkwọ dị N’ọmụmụ Agụmagụ Ọdịnala Igbo N’ụlọakwụkwọ Praịmarị dị na Zoon Mmụta Nsụka
Abstract
Nchọcha a lebara anya na mmetụta adịmire ngwa nkuzi nụrụlere n’ebe mmeta nkeọma ụmụakwụkwọ dị n’ọmụmụ agụmagụ ọdịnala Igbo n’ụlọakwụkwọ praịmarị dị na zoon mmụta Nsụka. Agụmagụ ọdịnala bụ agụmagụ a na-akọ n’ọnụ nke si n’aka nna nna fere n’aka ụmụ ha. E ji ya akwalite omenala n’ihi na e si na ya amụta omenala. Nsogbu ụfọdụ a na-ahụ n’ọmụmụ agụmagụ ọdịnala sitere na ngwa nkuzi e ji akụzi ya. Ngwa nkuzi nụrụlere kacha mma iji mee nke a. Ngwa nkuzi nụrụlere sitere n’okwu abụọ bụ nụrụ (ịnụ na ntị) na lere (ile n’anya) e jikọtara ọnụ ka ọ bụrụ otu mkpụrụokwu. Ọ bụ ya kwesiri iji wee na-akụziri ụmụakwụkwọ praịmarị agụmagụ ọdịnala Igbo. Ọ bụ ọnọdụ a kpaliri nchọcha a iji chọpụta ka ngwa nkuzi nụrụlere si dị ire n’ebe mmeta nkeọma ụmụakwụkwọ praịmarị dị n’ọmụmụ agụmagụ ọdịnala Igbo. Otu ajụjụ nchọcha – Kedu akara miin mmeta nkeọma ụmụakwụkwọ ndị e ji ngwa nkuzi nụrụlere kuziere agụmagụ ọdịnala Igbo na ndị e jighị? nakwa otu ụma okwu - E nweghị ezigbo ndịmiche dị na miin mmeta nkeọma ụmụakwụkwọ ndị e ji ngwa nkuzi nụrụlere kuziere agụmagụ ọdịnala Igbo na ndị e jighị - ka e wepụtara maka nke a. Ụdị nchọcha a bụ nke nchọpụta. Ngwa nchọcha e ji mee nchọcha a bụ njụmaza – bụ Nnwale Mmetadebe Agụmagụ Ọdịnala Igbo (NMAỌI). Ndị ọkachamara nọ na ngalaba Edukeshọn na Lingwistiks (Sayensị Asụsụ) na Asụsụ Ala Naịjirịa na Mahadum Naịjirịa, Nsụka tulere ya. Data e nwetara bụ nke e ji miin na ndịpụ n’izugbe wee nyocha ma tulekwa. Nchọpụta gosiri na ụmụakwụkwọ e ji ngwa nkuzi nụrụlere kuziere agụmagụ ọdịnaala Igbo ka emeta nkeọma n’ agụmagụ ọdịnala Igbo karịa ndị e jighị. A tụnyere ọtụtụ aro nke gụnyere ka a naeji ngwa nkuzi nụrụlere akụziere ndị nkuzi a na-azụ na kọleji kedukeshọn na mahadum ka ha wee mụta ma jiri mmụta ha nwetara kuziere ụmụakwụkwọ nọ n’ụlọakwụkwọ praịmarị ka ha nwee ike imeta nkeọma n’agụmagụ ọdịnala Igbo. Atụnyekwara aro ka a na-eziga ndị nkuzi ọzụzụ mmụgharị arụmarụ kwa mgbe kwa mgbe ebe a ga-azụ ha ezigbo ọzụzụ maka iji ngwa nkuzi nụrụlere akụzi agụmagụ ọdịnala Igbo n’ụlọakwụkwọ praịmarị tinyekwazi ka ndị ngalaba na-ahụ maka iwe ndị nkuzi n’ọrụ bụ Enugu State Universal Basic Education Board (ESUBEB) na-enye asụsụ Igbo nkwado site n’ịhụ na sọọsọ ndị nkuzi azụrụ nkeọma n’asụsụ Igbo bụ ndị ga na-akụzi asụsụ Igbo nke ga-eme ka ụmụakwụkwọ na-emeta nkeọma n’agụmagụ ọdịnala Igbo n’ụlọakwụkwọ praịmarị