Mmetụta Olundị Nsụka Na Nkuzi Na Ọmụmụ Asụsụ Igbo Izugbe N’Ụlọakwụkwọ Praịmarị N’Okpuru Ọchịchị Nsụka

  • Dr Monica Obiageli Omeje
Keywords: Olundị, Igbo Izugbe, Fonịm, Fọnọlọjị

Abstract

Mbunuche nchọcha a bụ ịchọpụta ka olundị Nsụka si emetuta nkuzi na ọmụmụ Igbo izugbe n’ ụlọakwụkwọ praịmarị dị n’okpuru ọchịchị Nsụka na steeti Enugu. Nchọcha a lebere anya kpom kwem n’ịmata ka fọnịm olundị Nsụka si emetuta ụmụ akwụkwọ n’ọmụmụ Igbo Izugbe. Onye nchọcha gbasoro usoro sọvee nkọwa wee mee nchọcha a. Otu ajụjụ nchọcha ka e jiri mee nchọcha a. Ndị e jiri mee nchọcha bụ ụmụ akwụkwọ praịmarị ukwu niile nọ n’okpuru ọchịchị Nsụka. Ndị e jiri mee nchọcha a kpọm kwem bụ ụmụ akwụkwọ praịmarị nke ise ọnụọgụ ha di otu narị na iri ise (150). Ọ bụ usoro nsere ka onye nchọcha gbasoro were họpụta ndị e jiri mee nchọcha a. Ngwa nchọcha bụ ajụjụ ọnụ na ndepụta mkpụrụokwu nke onye nchọcha hibere. Onye nchọcha gbasoro usoro frikwensi na pasenti wee tụchaa data o ji rụọ ọrụ na nchọcha a. Nchọpụta nchọcha gosiri na fonịm olundi Nsụka na-emetuta ụmụ akwụkwọ praịmarị n’ ọmụmụ Igbo izugbe. Site n’ihe a chọpụtara, onye nchọcha tụrụ aro maka nkwalite ọnọdu nkuzi na ọmụmụ asụsụ Igbo ọ kachasị n’ogo praịmarị na Nsụka.

Published
2024-06-08
Section
Articles