Ọnọdụ enweghi nchekwa obodo na nchekwa mkpụrụokwu n’asụsụ ọdịnala: NNyocha ekwumekwu na mmekọrịta ọha
Abstract
Ekwumekwu bụ ụzọ mmadụ na ibe ya nwere ike isi zikọrịta ozi, kparịta ụka ma tụlegharịkọta echiche n’ọnọdụ ọbụla. I ji mee ka ekwumekwu di nro ma nweta mmetụta a tụrụ anya ya, etu esi họrọ mkpụrụokwu dị oke mkpa. Na nchọcha a, enyochara ekwumekwu dị iche iche e jiri mee mkparịta ụka n’ọnọdụ enweghi nchekwa n’obodo Naịjirịa i ji chọpụta mmetụta mkpụrụokwu nwere ike inwe na ndụ ụmụ amaala n’ọnọdụ enweghi nchekwa. A họtara ekwumekwu e mere n’igwe onyonyo ụlọ nzisa ozi Arise gbasara ọnọdụ ọgbaaghara Naịjirịa dịka ngwa nchọcha a . Njumaza, nkọwa na nchịkọta bụ nja e jiri tulee azịza ụmụ nwokeiri ise (50) naụmụ nwanyị iri na anọ (14) sonyere na nchọcha a nyere.Agbakwasịrị ụkwụ na atụtụ sitizen sosiolingwistiks, iji tụcha azịza ndị a. Nchọpụta nchọcha a rụtụrụ aka na mkpụrụokwu ndị e jiri mee ekwumekwu a gosiri na mmetụta mweta n’ike (MmI) na nke aghụghọ (MA) pụtara ihe nke ọma. Nke a pụtara na ụmụ amaala nwetara mmetụta mmegbu na aghụghọ nke kpaliri mmụọ mbibi na ọgụ n’etiti agbụrụ dị iche iche. epuola ome n’ obi ụfọdụ agbụrụ nke mere na ụmụ amaala enwekwaghị nzọrọmahụ . N’ị ga n’ihu, nchọpụta a tupenyere azụ na, ọ ga-ara ahụ iweghachita ịdị n’otu nke agbụrụ na agbụrụ n’obodo Naijirịa. Alo nchọcha a gbakwasiri ụkwụ n’ichekwaba mkpụrụokwu ọdịnala e ji ekwu okwu n’ọnọdụ dị iche iche maka iwulite nka ekwumekwu maka mmekọrịta ọ kachasị n’ọnọdụ enweghi nchekwa n’obodo.