Ntọrị n’Ala naịjirịa, ka Ọ dị Gboo nakwa Ugbu a
摘要
Ntọrị bụ otu n’ime mpụ nke a na-ahụ na gburugburu anyị taa. Ọ bụ ọnọdụ a na-akpụrụ mmadụ n’ike ma dulaa ya ala mmụọ ma ọ bụkwanụ napụta ya ọkpụrụkpụ ego na ihe ndị ọzọ o nwere. Ntọrị malitererịị kamgbe gboo mana mmepe obodo emeela ka ụfọdụ mgbanwe pụta ihe n’etiti ntọrị mmadụ ugbu a na ka ọ dị mgbe gboo. Ọ bụkwa nke a mere e ji nwee ọtụtụ mkpụrụokwu na ekwumekwu ụfọdụ e ji akọwa ọdịdị mpụ a bụ ntọrị, taa. N’ihi nke a, mbunuche nchọcha a bụ ileba anya ka ntọrị mmadụ si dị na mbụ nakwa ka ọ dị ugbu a tụmadị ka o si metụta akụnaụba Naijirịa. Ọrụ nchọcha a ga-elebakwa anya n’ekwumekwu na okwu ụfọdụ e ji akọwapụta ntọrị, dịka o si pụta ihe n’akwụkwọ mgbasa ozi nakwa na mkparita ụka ụfọdụ na Naijirịa. Nnweta njiatule e jiri mee nchọcha a dabeere n’ozi ndị nchọcha nwetara site n’ajụjụ ọnụ ha gbara nakwa site na nnyocha agụmagụ ndị ọzọ e derela nke isiokwu ha metụtara ntọrị. Ndị nchọcha chọpụtara na ntọrị mmadụ na-ewu ewu ugbu a na Naijirịa nakwa ụwa niile nke ebumnobi ndị na-eme ya dịwagara iche na nke ndị mere ya na gboo. Ha gara n’ihu chọpụta ụfọdụ ekwumekwu na okwu ọhụrụ e ji akọwa ntọrị dị ka mwakpo, mnwuchi, ntọgbu, mmemina na ndị ọzọ. Orụ nchọcha a ga-aba uru maka ụfọdụ nchọcha a ga-eme n’isiokwu a nakwa ime ka mpụ a bụ ntọrị belata.