Ikuzi Omenaala ḷlụ Nwaanyi n’ala Igbo maka iwube Ntọala Ezinaụlọ bido n’Ogo Sekọndịrị Ukwu
摘要
Nchọcha a lebara anya ma nyocha Omenaala dị n’ịlụ nwaanyịn’ala Igbo na uru ọ bara ikuziri ya ụmụ akwụkwọ n’ogo agụmakwụkwọ sekọndịrịmaka iwube ntọala ezinaụlọ n’obodoala Igbo. Ndị Igbo kwenyere na ijikọta nwoke na nwaanyịn’usoro omenaala alụmdi na nwunye maka iwube ezinaụlọ ahụ. N’ala Igbo, ha kwenyere n’ịlụ nwaanyị abụghị naanị maka nwoke na nwaanyị naalụ onwe ha kama na ịlụ nwaanyị bụ ihe ụmụnna n’ala Igbo. Nkwenye nke a mere na ndị chọrọ ịlụ di na nwunye na-agbaso ụsoro ndị ahụ ndị nna ochie wubere, bụ nke ndị Igbo ejighi egwu egwu. Site n’ịgbaso usoro omenaala mee nke a, mbikọ ha na-enwe ugwu na nsọpụrụ ma mekwa ka ụmụaka ga-esite na njịkọ ahụ pụta bụrụ ụmụaka ziri ezi n’anya mmadụ. Onye nchọcha lebara anya n’omenaala ndị ahụ a na-atụ anya na ndị na-ebido ezinaụlọ ọhụụ tosiri ime maka alụmdi na nwunye na ndụ ndị Igbo nke gosiri mkpa ọ dị na nwoke ọ bụla ga-alụrịrị nwunye. Nchọpụta gosiri na onye alụghị di ma ọ bụ nwunye n’ala Igbo anaghị enwecha ugwu na nsọpụrụ dịrị ha maka na ndị Igbo kwenyere na onye a mụrụ amụ tosiri ịmụta onye ọzọ ka ndụ na mmadụ na-abawanye n’elu ụwa. Ọzọ kwa bụ na ikuziri ya ụmụ akwụkwọ bido n’ogo agụmakwụkwọ sekọndịrị ga-enye aka ịzụlite ha n’usoro ahụ dị mma maka iwube ntọala ezinaụlọ enweghi oke ekworo na esemokwu n’obodo ala Igbo.N’ikpeazụ,onye nchọcha tụtara aro nke ga-enye aka ime ka omenaala ndị Igbo hapụ ịnwụnyụ anya maka na omenaala ndị na-echekwaba ha..